Wiki Loves Africa 2024/Isiokwu
Isiokwu a bụ Afrịka Na-Ékè na-àjá mma bụ nkepụta, mmepụta, nakwa/maọbu ọrụrụ nke ihe dị iche iche site n'aka ndị Afrịka n'akụkụ niile nke Afrịka gbaa gburugburu. Dịka isiokwu, Afrịka Na-Ékè metụtara n'ozuzu òkè nkepụta ǹkà n'ụzọ niile: ǹkà, ịchọ mma, ihe nkiri, ịgba egwú, akwụkwọ ọgụgụ, mmepụta na ịchọ ákwà oyiyi mma, ihe oňụňụ, isi nri n'akụkụ okporo ámá, iji ụzọ ọdịnala dị iche iche maọbukwanu ụzọ ọgbaraọhụrụ dị iche iche emepụta ihe. O nwekwara ike idetukọta nkepụta, mmepụta maọbu nrụgharị n'ụzọ ọgbaraọhụrụ ihe ha dị iche iche a na-ere ere maọbu mmepụta ha n'ụlọ ọrụ mmepụta dị iche iche n'ógó bụrụ ibu, dịka nrụgharị nri oriri, mmepụta ihe ọňụňụ, mmepụta seramiiki, ákwà, nakwa ihe ndị eji ebi n'ụlọ nakwa mmepụta n'ógó bụrụ ibu, ọmụmaatụ, mgbari ígwè, ọrụ njinia maọbu ịmepụta gilaasị.
Afrịka Na-Ékè nwere mmasị ya n'usoro nkepụta ihe karia na ihe ekepụtara ma na-elegara anya n'ịja mma nakwa igosipụta mmụọ nkepụta ihe nke ndị mmadụ dịka ọ na-eme. Ihe nlekwasị anya nke onye na-ese foto maọbu onye na-emepụta ihe nkiri maọbu onye na-egosipụta naanị ụ̀dà kwesịrị ịbụ n'iseta usoro nke mmepụta maọbu nkepụta ihe, n'abughị na ihe ahụ ekepụtara n'onwe ya. Ọ bụrụ na egosipụta ihe ekepụtara, biko si emekwala ya ka ọ bụrụ ya bụ ebe nlereanya kpọmkwem nke ihe Osise ahụ.
Isi sekpụ ntị na ihe ndị esere ga-enwe mmeri na-elekwasị anya na ihe ndị gosipụtara usoro (nke mmepụta maọbu nkepụta ihe) n'abughị na ihe arụpụtara n'onwe ya.
Ngwa lee ụfọdụ ntụpenye azụ na ihe ndị a gá-elekwasi anya gbasara isiokwu
Isiokwu Gasị
Nkepụta ihe,
Nrụgharị ihe,
Mmepụta ihe,
Ọrụ ngo,.Ihe ndị Emere n'Afrịka,
Ọrụ ǹkà,
Njikọ,
Ọ̀gbọ́ njikọ gasị,
Ụlọ ọrụ nrụpụta,
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe eji arụ ákwà a na-eyi n'ahụ
Ọ̀gbọ́ nrụpụta ihe
Nkwalite nke ihe ndị arụrụ arụ
Nnyocha na nkwalite
Ụlọ ọrụ ọdịnala
Ǹkà
Ịchọ mma
Nkepụta site n'uche mmadụ
Ihe ndị si n'ụbụrụ
Nkụkọta ígwè
==Ntụpenye azụ maka ngalaba gasị ndị ga-akpaki nakwa ndị a aga-egosipụta n'ịntaneetị
Name | Link |
---|---|
Nrụpụta | Category:Production |
Ị́kpa ihe | Category:Weaving |
Mmepụta ite | Category:Manufacture of pottery |
Ngwá egwu | Category:Manufacture of musical instruments |
Nri | Category:Manufacture of food and cooking |
Kọfị̀ | Category:Manufacture of coffee |
Akwụkwọ ide ihe | Category:Manufacture of paper |
Ịfụkeli gilaasị | Category:Glassblowing |
Ọrụ osisi | Category:Woodworking |
Mmepụta ìgbé ntinye mmanya | Category:Crates making |
Ịkpụ ihe | Category:Sculpturing |
Ndị ọrụ aka ebe ha nọ ọrụ | Category:Artisans at work |
Ụmụ nwoke na-ákpà ihe | Category:Men weaving |
Ịkpa ǹkàtà | Category:Basket makers at work |
Ịkpụ nkume | Category:Stone carvers at work |